NKPUGHE 21

1 M’we hu elu-igwe ọhu na uwa ọhu: n’ihi na elu-igwe mbu ahu na uwa mbu ahu gabigarari; oké osimiri adighi kwa ọzọ.

2 M’we hu obodo nsọ ahu, bú Jesusalem ọhu, ka ọ nēsi n’elu-igwe ridata, site n’ebe Chineke nọ, edoziwo ya dika nwanyi anālu ọhu nke achọworo ya nma nye di-ya.

3 M’we nu oké olu ka ọ nēsi n’oche-eze ahu dà, si, Le, ūlọ-ikwū nke Chineke diyere madu, Ọ gēbiye-kwa-ra ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nke Ya, Chineke Onwe-ya gānọye-kwa-ra ha, buru kwa Chineke-ha:

4 Ọ gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n’anya-ha; ọnwu agaghi-adi kwa ọzọ; iru-újú ma-ọbu ikwa-ákwá ma-ọbu aru-ufu agaghi-adi kwa ọzọ: ihe ngbu nile agabigawo.

5 Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu we si, Le, anameme ihe nile ka ha di ọhu. O we si, De akwukwọ: n’ihi na okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu.

6 O we sim, Emewo ha. Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, nmalite na ọgwugwu. Mu onwem gēnye onye akpiri nākpọ nku miri site n’isi-iyi miri nke ndu ahu n’efu.

7 Onye nēmeri gēketa ihe ndia; M’gābu-kwa-ra ya Chineke, ya onwe-ya gābu-kwa-ram nwa.

8 Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkweghi ekwe, na ndi-árú, na ndi-ob͕u-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ ńsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu.

9 Otù nime ndi-mọ-ozi asa ahu ndi nwere ọkwa asa ahu, ndi eboro ibu ihe-otiti asa ikpe-azu, we bia; o we kpayerem uka, si, Biari, M’gēgosi gi nwanyi ahu anālu ọhu, bú nwunye Nwa-aturu ahu.

10 O we bupum nime Mọ Nsọ ga rue oké ugwu di elu, we gosim obodo nsọ ahu, bú Jerusalem, ka ọ nēsi n’elu-igwe ridata, site n’ebe Chineke nọ,

11 nēnwe ebube Chineke: ìhè ọ nēnye yiri nkume dikarisiri oké ọnu-ahia, dika nkume jasper, dika crystal:

12 o nwe-kwa-ra oké mb͕idi di elu; nwe kwa ọnu-uzọ-ama iri na abua, nwe kwa ndi-mọ-ozi iri na abua n’ọnu-uzọ-ama ahu; nwe kwa aha edekwasiworo ha, nke bu aha nke ebo iri na abua nke umu Israel:

13 n’akuku Ọwuwa-anyanwu ọnu-uzọ-ama atọ di; n’akuku Ugwu ọnu-uzọ-ama atọ di kwa; n’akuku Ndida ọnu-uzọ-ama atọ di kwa; n’akuku Ọdida-anyanwu ọnu-uzọ-ama atọ di kwa.

14 Mb͕idi obodo ahu nwe-kwa-ra ntọ-ala iri na ab͕ua, n’elu ha ka edereri aha iri na abua nke ndi-ozi iri na abua ahu nke Nwa-aturu ahu.

15 Onye ahu nke nākpayerem uka nwe-kwa-ra ihe-ọtùtù, bú amì nke ọla-edo, ka o we tùa obodo ahu, na ọnu-uzọ-ama-ya nile, na mb͕idi-ya.

16 Obodo ahu nwe-kwa-ra nkuku anọ ra nrata, ogologo-ya ra kwa ka obodobo-ya: o we were amì ahu tùa obodo ahu, orú nnù furlong na nnù iri: ogologo-ya na obodobo-ya na elu-ya ra.

17 O we tù mb͕idi-ya, ọgu cubit asa na anọ, dika ọtùtù madu si di, ya bu, nke mọ-ozi.

18 Ihe eji lu mb͕idi ahu bu jasper: obodo ahu bu kwa ọla-edo anuchara anucha, dika enyo nēnwu enwu.

19 Ewerewo nkume nile ọ bula di oké ọnu-ahia chọ ntọ-ala nke mb͕idi obodo ahu nma. Ntọ-ala mbu bu jasper; nke-abua bu sapphire; nke-atọ bu chalcedony; nke-anọ bu emerald;

20 nke-ise bu sardonyx; nke-isi bu sardius; nke-asa bu chrysolite; nke-asatọ bu beryl; nke-iteghete bu topaz; nke-iri bu chrysoprase; nke-iri-na-otù bu jacinth; nke-iri-na-abua bu amethyst.

21 Ọnu-uzọ-ama iri na abua ahu bu pearl iri na abua; eji otù pearl me ọnu-uzọ-ama ọ bula nime ọnu-uzọ-ama ahu nile: amá obodo ahu bu ọla-edo anuchara anucha, dika enyo nāhu uzọ.

22 Ọ dighi kwa ulo nsọ ọ bula m’huru nime ya: n’ihi na Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile, Ya na Nwa-aturu ahu, bu ulo nsọ ya.

23 Anyanwu ma-ọbu ọnwa adighi kwa obodo ahu nkpà, ka ha mukwasi ya: n’ihi na ebube Chineke nyere ya ìhè, oriọna-ya bu kwa Nwa-aturu ahu.

24 Mba nile gēwere kwa ìhè-ya jegharia: ndi-eze nke uwa nēwebata kwa ebube-ha nime ya.

25 Agaghi-emechi kwa ọnu-uzọ-ama-ya n’ehihie ma-ọli (n’ihi na abali agaghi-adi n’ebe ahu):

26 ha gēwebata kwa ebube na nsọpuru nke mba nile nime ya:

27 ọ dighi kwa ihe ọ bula emeruru emeru, ma-ọbu onye nēme ihe-árú na ugha, gābà nime ya ma-ọli: kama ọ bu nání ndi edeworo aha-ha n’akwukwọ nke ndu Nwa-aturu ahu.