JENESIS 19

1 Abua nime ndi-mọ-ozi ahu we biarue Sọdọm n’anyasi; ma Lot nānọdu n’ọnu-uzọ-ama Sọdọm: Lot we hu ha anya, bilie izute ha, ọ da kpue iru-ya n’ala,

2 si, Biko, le, ndi-nwem, biko, sinu n’ije-unu wezuga onwe-unu bà n’ulo orù-unu, nọ ọnọdu-abali, sa kwa ukwu-unu, unu gēbili n’isi-ututu, la, Ha si, É-è, kama ọ bu n’amá ka ayi gānọ ọnọdu-abali.

3 O rugide ha nke-uku; ha we si n’ije-ha wezuga onwe-ha jekuru ya, ba n’ulo-ya; O we mere ha oké oriri, sie achicha ekoghi-eko, ha rie.

4 Ma tutu ha edina, ndikom obodo ahu, bú ndikom Sọdọm, b͕ara ulo ahu buru-buru, ma okorọbia ma agadi, ndi ala ahu nile site n’akuku ọ bula;

5 ha we kpọ Lot òkù, si ya, Òle ebe ha nọ, bú ndikom ndi bakutere gi n’abali a? me ka ha putakute ayi, ka ayi we mara aru-ha.

6 Lot we pukuru ha rue ọnu-uzọ, mechie uzọ n’azu ya.

7 Ọ si, Biko, umu-nnem, unu emela ihe ọjọ.

8 Biko, le, enwerem umu-ndinyom abua ndi akāmaghi aru nwoke: biko, ka m’kuputara unu ha, me-kwa-nu ha dika ọ di nma n’anya-unu: nání unu emela ndikom ahu ihe; n’ihi na ọ bu n’ihi nka ka ha biara n’okpuru ndò nke ulom.

9 Ha si, Pua n’uzọ. Ha si kwa, Otù onye a batara inọ dika ọbia, ọ we nēkpe ikpe nke ukwu: ub͕u a ayi gēme gi ihe kari ihe ayi gēme ha. Ha we rugide nwoke ahu, bú Lot, nke-uku, biarue nso itiwa ibo-uzọ.

10 Ndikom ahu we setipu aka-ha, me ka Lot bakute ha n’ulo, ha we mechie uzọ.

11 Ha we were ikpu-ìsì tie ndikom ahu ndi nọ n’ọnu-uzọ ulo, ma onye ntà ma onye uku: ike we gwu ha ichọta ọnu-uzọ ahu.

12 Ndikom ahu we si Lot, Ọ̀ di onye i nwere n’ebe a ọzọ? di nwa-gi, na umu-gi ndikom, na umu-gi ndinyom, na onye ọ bula i nwere n’obodo a; me ka ha si n’ebe a pua:

13 n’ihi na ndi nēbibi ebe a ka ayi bu, n’ihi na iti-nkpu-ha aghọwo ihe uku n’iru Jehova; Jehova ezitewo kwa ayi ibibi ya.

14 Lot we pua, gwa di umu-ya, ndi nālu umu-ya ndinyom, okwu, si, Bilienu, si n’ebe a pua; n’ihi na Jehova nēbibi obodo a. Ma ọ di ka onye nākwa emò n’anya di umu-ya.

15 Ma mb͕e chi bọrọ, ndi-mọ-ozi ahu nukpọrọ Lot, si, Bilie, chiri nwunye-gi, na umu-gi ndinyom abua ndi ahuru n’ebe a; ka ewe ghara ikpochapu gi n’ahuhu ajọ omume obodo a.

16 Ma ọ b͕agwojuru ya anya; ndikom ahu we jide aka-ya, jide kwa aka nwunye-ya, jide kwa aka umu-ya ndinyom abua; n’ihi na Jehova nwere ọmiko n’aru ya: ha we me ka ọ puta, me ka ọ nọdu n’azu obodo.

17 O rue, mb͕e ha mesiri ka ha puta n’azu obodo, na ọ siri, Wepuga onwe-gi n’ihi ndu-gi; elekwala anya n’azu gi, eguzokwala na Gburugburu-ala a nile; wepuga onwe-gi je ugwu ahu, ka ewe ghara ikpochapu gi.

18 Lot we si ha, É-è, biko, onye-nwem:

19 biko, le, orù-gi ahutawo amara n’iru gi, i mewo kwa ka ebere-gi di uku, nke i meworom n’idebem ndu; mu onwem apughi kwa iwepuga onwem je ugwu, ka ihe ọjọ ahu we ghara irapara n’arum, m’we nwua:

20 biko, le, obodo a di nso ib͕alaga n’ebe ahu, nke ahu bu kwa obodo ntà: biko, ka m’wepuga onwem je ebe ahu, (ọ̀ bughi obodo ntà?) nkpuru-obim gādi kwa ndu.

21 Ọ si ya, Le, m’huwo kwa gi iru-ọma n’okwu a, na m’gaghi-akwatu obodo a nke i kwuworo okwu bayere ya.

22 Me ngwa, wepuga onwe-gi je ebe ahu; n’ihi na apughm ime ihe rue mb͕e i gābà n’ebe ahu. N’ihi nka ka akpọrọ aha obodo ahu Zoa.

23 Anyanwu awawo n’elu uwa mb͕e Lot batara nime Zoa.

24 Jehova we me ka brimstone na ọku si n’elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n’ebe Jehova nọ;

25 O we kwatue obodo ndia, na Buruburu-ala ahu nile, na ndi nile bi n’obodo ahu nile, na ihe-opupú nke ala.

26 Ma nwunye-ya siri n’azu Lot leghachi anya n’azu, we ghọ ogidi nnú.

27 Abraham we bilie n’isi-ututu je ebe ahu nke o guzorori n’iru Jehova:

28 ọ le anya n’ebe Sọdọm na Gọmọra di, na n’ebe ala nile nke Buruburu-ala ahu di, ọ we hu, ma, le, anwuru-ọku nke ala ahu rigoro dika anwuru-ọku nke oké ọku.

29 O rue, mb͕e Chineke bibiri obodo nile nke Buruburu-ala ahu, na Chineke chetara Abraham, we si n’etiti nkwatu ahu zipu Lot, mb͕e Ọ kwaturu obodo nke Lot biri nime ha.

30 Lot we si na Zoa rigo, biri n’ugwu ahu, ya na umu-ya ndinyom abua; n’ihi na ọ turu egwu ibi nime Zoa: ọ we biri n’ọb͕à, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom abua.

31 Ada we si nke-ntà, Nna-ayi aghọwo agadi, ma ọ dighi nwoke n’uwa ibakute ayi, dika uzọ uwa nile si di:

32 bia, ka ayi me nna-ayi ka ọ ṅua manya-vine, ka ayi na ya dina kwa, ka ayi we site na nna-ayi debe nkpuru ndu.

33 Ha we me ka nna-ha ṅua manya-vine n’abali ahu: ada we ba, ya na nna-ya we dina; ma nna-ya amaghi mb͕e o dinara, na mb͕e o biliri.

34 O rue n’echi-ya, na ada siri nke-ntà, Le, mu na nnam dinara n’abali nyahuru: ka ayi me ka ọ ṅu kwa manya-vine n’abali a; gi ba kwa, gi na ya dina, ka ayi we site na nna-ayi debe nkpuru ndu.

35 Ha we me ka nna-ha ṅu kwa manya-vine n’abali ahu: nke-ntà we bilie, ya na nna-ya we dina; ma nna-ya amaghi mb͕e o dinara, na mb͕e o biliri.

36 Umu Lot ndinyom abua we turu ime site n’aka nna-ha.

37 Ada we mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Moab: onye ahu bu nna ndi Moab rue ta.

38 Nke-ntà kwa, ya onwe-ya mu-kwa-ra nwa-nwoke, kpọ aha-ya Ben-ami: onye ahu bu nna umu Amon rue ta.