1 Tonu Ja.
Tonu, unu ndi-orù Jehova,
Tonu aha Jehova.
2 Ka aha Jehova buru ihe agọziri agọzi
Site n’ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.
3 Site n’ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya
Aha Jehova gābu ihe anēto eto.
4 Jehova di elu n’elu mba nile,
N’elu elu-igwe ka ebube-Ya di.
5 Ònye di ka Jehova, bú Chineke-ayi?
Nke nēme Onwe-ya ka Ọ di elu inọdu ka eze,
6 Nke nēme Onwe-ya ka Ọ di ala ilekwasi
Elu-igwe na ilekwasi uwa anya.
7 Ọ bu onye nēme ka onye nēnweghi ike si n’ájá bilie,
O nēsi n’ebe ikpofu ahihia bulie ob͕eye elu;
8 Ime ka ya na ndi amara aha nọkọ,
Ka ya na ndi amara aha-ha n’etiti ndi-ya nọkọ.
9 Ọ bu onye nēme ka nwayi-àgà nke ulo biri n’ezi-na-ulo nke aka ya,
Buru nne nāṅuri ọṅu nke muworo umu-ndikom.
Tonu Jehova.