ILU 12

1 Onye nāhu idọ-aka-na-nti n’anya nāhu ihe-ọmuma n’anya:

Ma onye nākpọ iba-nba asì bu anu-ọhia.

2 Ezi madu gēnweputa n’aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ:

Ma onye nzube ọjọ ka Ọ gāma ikpe.

3 Madu agaghi-eguzosi ike site na nmebi-iwu:

Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume, agaghi-eropu ya.

4 Nwanyi nke nējide onwe-ya nke-ọma bu okpu-eze di-ya:

Ma ọ di ka ire-ure n’ọkpukpu di-ya, bú nwayi nēweta ihere.

5 Èchìchè nile nke ndi ezi omume bu ezi ikpé:

Ma ndum-ọdu nile nke ndi nēmebi iwu bu aghughọ.

6 Okwu nile nke ndi nēmebi iwu bu iche anwu ọbara:

Ma ọnu ndi ziri ezi gānaputa ha.

7 Asi na ekpùe ndi nēmebi iwu iru, ha anọghi kwa:

Ma ulo ndi ezi omume gēguzo.

8 Dika ezi uche-ya si di ka agēto onye ọ bula:

Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n’obi gāghọ onye anēleda.

9 Ọ di nma, bú onye anēlelì, ma o nwere orù,

Kari onye nāsọpuru onwe-ya, ma nri kọrọ ya.

10 Onye ezi omume mara ndu anu-ulo-ya:

Ma obi-ebere nile nke ndi nēmebi iwu bu enweghi-obi-ebere.

11 Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri:

Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, obi amam-ihe kọrọ ya.

12 Onye nēmebi iwu achọsiwo ọnyà ndi ọjọ ike:

Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume nāmi nkpuru.

13 Na njehie nke eb͕ub͕ere-ọnu ka ọnyà onye ọjọ di:

Ma onye ezi omume gēsi n’ahuhu puta.

14 Site na nkpuru nke ọnu onwe-ya ka afọ gēju onye ọ bula n’ezi ihe:

Ọzọ, nmeso aka madu nke ọ nēmeso madu-ibe-ya, nke ahu ka agēnyeghachi ya.

15 Uzọ nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ya ziri ezi n’anya ya onwe-ya:

Ma onye nēge nti ndum-ọdu ka onye mara ihe bu.

16 Onye b͕agọrọ ab͕agọ n’uche-ya, n’otù ubọchi ahu ka anāmara iwe anākpasu ya:

Ma onye nēkpuchi nlelì ka onye nwere ezi uche bu.

17 Onye nēkupu ikwesi-ntukwasi-obi dika ume nēgosi ezi omume,

Ma onye-àmà okwu-ugha nēgosi aghughọ.

18 O nwere onye nēkwu okwu nēchèghi echè dika ndupú nke mma-agha:

Ma ire ndi mara ihe bu ihe nāgwọ madu.

19 Eb͕ub͕ere-ọnu ezi-okwu gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi:

Ma nání rue otù ntabi-anya ka ire okwu-ugha di.

20 Aghughọ di n’obi ndi nēchèputa ihe ọjọ:

Ma ndi nādu ọdu udo nwere ọṅù.

21 Ọ dighi ajọ ihe ọ bula gādakwasi onye ezi omume:

Ma ndi nēmebi iwu ejuputawo n’ihe ọjọ.

22 Ihe-árú n’anya Jehova ka eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha bu:

Ma ndi ji ezi-okwu eme ihe bu ndi ihe-ha nātọ Ya utọ.

23 Madu nke nwere ezi uche nēkpuchi ihe-ọmuma:

Ma obi ndi-nzuzu nākpọsa uche b͕agọrọ ab͕agọ.

24 Aka ndi di nkọ gāchi achi:

Ma onye-ume-ngwu gādi n’usu ndi nēfè òfùfè.

25 Ncheb͕u n’obi madu nēme ka obi ruru ala;

Ma okwu ọma nēme ka ọ ṅuria.

26 Onye ezi omume nēgosi madu-ibe-ya uzọ:

Ma uzọ ndi nēmebi iwu nēme ka ha kpafue.

27 Onye-ume-ngwu adighi-aru anu ọ chutara na ntá:

Ma àkù madu nke di oké ọnu-ahia diri onye di nkọ.

28 N’uzọ ezi omume ka ndu di;

Ọzọ, n’uzọ nke okporo-uzọ-ya, ọ dighi ọnwu di ya.