Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; dika Jedutun si abù abù. Abù Ọma Devid.
1 Ọ bu nání Chineke ka nkpuru-obim nēdere du:
N’aka-Ya ka nzọputam si bia.
2 Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam:
Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n’ọnọdum ri nne.
3 Rùe ole mb͕e ka unu ganāwagide madu?
Unu nētipia ya, unu nile,
Dika mb͕idi ruru eruru, dika ogige nke anēnuda enuda.
4 Ọ bu nání isi na nbuli-elu-ya nupu ya ka ha b͕aworo ìzù;
Okwu-ugha nātọ ha utọ:
Ha nēji ọnu-ha agọzi, ma n’ime obi-ha ha nākọcha akọcha.Selah
5 Nēdere nání Chinek du, nkpuru-obim;
N’ihi na ọ bu Ya ka olile-anyam si puta.
6 Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam:
Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n’ọnọdum.
7 N’ebe Chineke nọ ka nzọputam na nsọpurum di:
Oké nkume nke ikem, bú ebe-nb͕abàm, di nime Chineke.
8 Tukwasinu Ya obi na mb͕e nile, unu ndi-Ya;
Wusinu obi-unu n’iru Ya dika miri:
Chineke buru ayi ebe-nb͕abà.Selah
9 Nání otù nku-ume ka ndi di ala bu,
ọ bu kwa okwu-ugha ka ndi di elu bu:
N’ihe-ọtùtù ha gàrigo elu dika ihe nfe;
Ndi ahu nile n’otù di nfe kari otù nku-ume.
10 Unu atukwasila obi na nmeb͕u,
Ọzọ, n’ipunara madu ihe unu aghọla ihe-efu:
Mb͕e àkù nābakari uba, unu atukwasila ya obi.
11 Otù ub͕ò ka Chineke kwuworo okwu,
Ub͕ò abua ka m’nuworo nka;
Na ike nile bu ihe Chineke nwere:
12 Ọ bu kwa Gi nwe ebere, Onye-nwe-ayi:
N’ihi na Gi onwe-gi nākwughachi madu ọ bula dika ọlu-ya si di.