ABÙ ỌMA 61

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n’elu ubọ-akwara. Abù Ọma nke Devid.

1 Chineke, nuru olu iti-nkpum;

Ṅa nti ekperem.

2 M’nēsi na nsọtu uwa kpọkue Gi, mb͕e, obim nādighi ike:

Rue n’oké nkume nke kam elu ka I gēdurum je.

3 N’ihi na I buworom ebe-nb͕abà,

Ulo-elu di ike ipu n’iru onye-iro.

4 Ka m’nọ dika ọbìa n’ulo-ikwū-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi:

M’gāb͕abà n’ebe-nzuzo nke nkù-Gi abua.Selah

5 N’ihi na Gi onwe-gi, Chineke, egewo nti nkwa nile m’kwere:

I werewo ihe-nnweta nke ndi nātu egwu aha-Gi nye ha.

6 I gātukwasi ọtutu ubọchi n’ubọchi ndu eze:

Arọ-ya nile gādi ka ọtutu ọb͕ọ.

7 O gēbi n’iru Chineke rue mb͕e ebighi-ebi:

Wezuga ebere na ezi-okwu, ka ha we nēchezi ya.

8 Otú a m’gābùku aha-Gi abù ọma rue mb͕e ebighi-ebi,

Ka m’we kwughachi nkwam nile kwa-ubọchi.