JENESIS 7

1 Jehova we si Noa, Ba n’ub͕ọ ahu, gi onwe-gi na ulo-gi nile; n’ihi na gi ka M’huworo bu onye ezi omume n’irum n’ọb͕ọ a.

2 Nime anu nile ọ bula di ọcha i gāchiputara onwe-gi asa asa, oke na nwunye ya; chiputa kwa abua abua n’anu nādighi ọcha, oke na nwunye-ya;

3 ufọdu kwa nime anu-ufe nke elu-igwe, asa asa, oke na nwunye: idebe nkpuru ndu n’elu uwa nile.

4 N’ihi na ọ fọduru ubọchi asa, Mu onwem gaje ime ka miri zosa n’uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali; M’gēkpochapu kwa n’elu ala ihe nile ọ bula di ndu nke M’meworo.

5 Noa we me dika iwu nile si di nke Jehova nyere ya.

6 Noa b͕ara nnù arọ na ọgu iri mb͕e iju-miri ahu di n’elu uwa.

7 Noa we si n’iru miri nke iju-miri ahu ba n’ub͕ọ ahu, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya na nwunye nile nke umu-ya ndikom.

8 Nime anu di ọcha, na nime anu nke nādighi ọcha, na nime anu-ufe na ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n’elu ala,

9 abua abua bakuru Noa n’ub͕ọ ahu, oke na nwunye, dika Chineke nyere Noa iwu.

10 O rue, mb͕e ubọchi asa ahu gasiri, na miri nke iju-miri ahu di n’elu uwa.

11 N’arọ nke-nnù-na-ọgu-iri nke ndu Noa, n’ọnwa nke-abua, n’ubọchi nke-iri-na-asa nke ọnwa, n’ubọchi ahu ka ab͕awara isi-iyi nile nke oké ob͕u-miri, emeghe-kwa-ra window nile nke elu-igwe.

12 Oké miri-ozuzo ahu we di n’elu uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali.

13 N’otù ubọchi ahu ka Noa, na Shem na Ham na Jefet, bú umu-ndikom Noa, na nwunye Noa, ha na nwunye nile nke umu-ya ndikom, bara n’ub͕ọ ahu;

14 ha onwe-ha, na anu-ọhia nile ọ bula di iche iche, na anu-ulo nile ọ bula di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nākpu akpu nke nākpu akpu n’elu uwa, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche, aha nnunu nile ọ bula.

15 Ha we bakuru Noa n’ub͕ọ ahu, abua abua nime anu-aru nile nke ume nke ndu di nime ya.

16 Ndi nāba n’ub͕ọ bara oke na nwunye sitere n’anu-aru nile, dika Chineke nyere ya iwu: Jehova we mechibido ya uzọ nime.

17 Iju-miri ahu we di n’elu uwa ọgu ubọchi abua; miri ahu we ba uba, bulie ub͕ọ ahu, ewe si n’elu uwa bulie ya elu.

18 Miri ahu di ike, ba uba nke-uku n’elu uwa; ub͕ọ ahu we nāgaghari n’elu miri.

19 Miri ahu di ike nke-uku n’elu uwa; ewe kpuchie ugwu nile di elu nke di n’okpuru elu-igwe nile.

20 Cubit iri na ise ka miri ahu di ike site n’elu ugwu; ewe kpuchie ugwu nile.

21 Anu-aru nile nke nākpu akpu n’elu uwa we kubie ume, nime anu-ufe, na nime anu-ulo, na nime anu-ọhia, na nime ihe nile ọ bula nēnuputa enuputa nke nēnuputa n’elu uwa, na madu nile ọ bula:

22 ihe ọ bula nke ume nke mọ nke ndu di n’oghere-imi-ya abua, nime ihe nile ọ bula nke di n’ala-ọkpọ-nku, ọ nwuru anwu.

23 O we kpochapu ihe nile ọ bula di ndu nke di n’elu ala, ma madu, ma anumanu, ma ihe nākpu akpu, ma anu-ufe nke elu-igwe: ewe kpochapu ha n’uwa: ọ we fọdu nání Noa na ndi ya na ha nọ n’ub͕ọ ahu.

24 Miri we di ike n’elu uwa ọgu ubọchi asa na iri.